1. Ihe Emere 28 IGBOB

1 Devid we kpọkọta ndi-isi nile nke Israel, bú ndi-isi ebo nile, na ndi-isi òkè nile ndi nējere eze ozi, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-isi àkù na anu-ulo nile eze nwere, na nke umu-ya ndikom nwere, ha na ndi-onozi, na ndi-dike, ọbuná dike ọ bula nke bu dìnkpà, rue Jerusalem.

2 Devid, bú eze, we guzo ọtọ n'ukwu-ya abua, si, Nurunum, umu-nnem, na ndim: mu onwem, ọ di n'obim iwuru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova ulo izu-ike, nke gābu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu Chineke-ayi; m'we dozie ihe iji ewu ulo.

3 Ma Chineke sirim, I gaghi-ewuru aham ulo, n'ihi na nwoke agha ka i bu, i wusiwo kwa ọbara.

4 Ma Jehova, bú Chineke Israel, rọputaram n'etiti ulo nile nke nnam ibu eze Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na Juda ka Ọ rọputara ibu onye-ndú; ma n'ulo Juda Ọ rọputara ulo nnam; ma n'etiti umu-ndikom nnam ihem tọrọ Ya utọ imem ka m'buru eze Israel nile:

5 ma n'etiti umum ndikom nile, (n'ihi na ọtutu umu-ndikom ka Jehova nyerem,) O we rọputa Solomon nwam inọkwasi n'oche-eze nke ala-eze Jehova dika onye-isi Israel.

6 O we sim, Solomon nwa-gi, onye ahu gēwu ulom na ogigem nile: n'ihi na arọputawom ya iburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna.

7 M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, ọ buru na ọ di ike ime ihe nile M'nyere n'iwu na ikpém nile, dika esi eme ta.

8 Ma ub͕u a, n'anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu.

9 Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.

10 Ub͕u a le anya; n'ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya.

11 Devid we nye Solom nwa-ya ihe-atù nke uzọ-nbata ulo uku Chineke, na nke ulo-ya nile, na nke ulo-àkù-ya nile, na nke ime-ulo-elu-ya nile, na nke ime-ime-ulo-ya nile, na nke ulo ebe-nkpuchi-nmehie:

12 na ihe-atù ihe nile nke di n'aka-ya site na Mọ Nsọ bayere ogige nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra ime-ulo nile di buruburu, bayere ulo-àkù nile nke ulo Chineke, baye-kwa-ra ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile:

13 baye-kwa-ra òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, baye-kwa-ra ije-ozi nile nke òfùfè ulo Jehova, baye-kwa-ra ihe nile nke òfùfè ulo Jehova:

14 nke ọla-edo n'ọtùtù bayere ihe ọla-edo, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula; nke ọla-ọcha bayere ihe ọla-ọcha nile n'ọtùtù, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula:

15 n'ọtùtù kwa bayere ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna nile ha nke ọla-edo, n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile: baye-kwa-ra ihe-idọba-oriọna nile nke ọla-ọcha, ọla-ọcha n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile, dika òfùfè ihe-idọba-oriọna ọ bula:

16 na ọla-edo n'ọtùtù bayere table nile achicha anēdo n'usoro, bú table ọ bula; ọla-ọcha kwa bayere table ọla-ọcha nile:

17 na ndudu nile, na ọkwa-nwusa nile, na iko nile, nke ọla-edo anāgwaghi agwa: baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-edo nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula; baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-ọcha nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula:

18 baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ọla-edo anuchara n'ọku n'ọtùtù: baye-kwa-ra ihe-atù ub͕ọ-ala, bú cherubim, ọla-edo, ndi nāb͕asa nkù-ha, kpuchie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

19 Ihe a nile ka Jehova were odide-akwukwọ me ka m'mata site n'aka-Ya n'arum, ka Devid kwuru, bú ije-ozi nile nke ihe-atù a.

20 Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.

21 Ma le, òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai di, ifè òfùfè nile nke ulo Chineke: onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo n'amam-ihe gādi kwa n'aka-gi n'ije-ozi ọ bula, ifè òfùfè ọ bula: ndi-isi na ndi Israel nile gēme kwa ka okwu-gi nile si di.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29