2. Ihe Emere 7 IGBOB

1 Ma mb͕e Solomon kpebìri ekpere, ọku siri n'elu-igwe ridata, we ripia àjà-nsure-ọku na àjà nile; ebube Jehova we juputa ulo ahu.

2 Ndi-nchu-àjà apughi kwa ibà n'ulo Jehova, n'ihi na ebube Jehova juputara ulo Jehova.

3 Umu Israel nile nēlekwasi kwa nrida ọku ahu anya, ya na ebube Jehova nke di n'elu ulo ahu; ha we ruru ala, kpuchie iru-ha n'ala n'elu pavement, kpọ isi ala, we kele Jehova, si, N'ihi na Ọ di nma; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4 Eze na ndi Israel nile nāchu kwa àjà n'iru Jehova.

5 Eze, bú Solomon, we chua àjà, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na ndi Israel nile we ra ulo Chineke nye Chineke.

6 Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.

7 Solomon we do etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke Solomon mere apughi inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba ahu.

8 Solomon we me ememe na mb͕e ahu ubọchi asa, ya na Israel nile, oké nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt.

9 Ha we me ememe nb͕ochi n'ubọchi nke-asatọ: n'ihi na ha mere ememe ira ebe-ichu-àjà nye Chineke ubọchi asa, me kwa ememe ahu ubọchi asa.

10 N'ubọchi nke-orú-na-atọ nke ọnwa nke-asa o we zilaga ndi Israel n'ulo-ikwū-ha, ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nke Jehova mere Devid, me-kwa-ra Solomon, me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

11 Solomon we wubìe ulo Jehova, na ulo eze: ma ihe nile nke batara n'obi Solomon ime n'ulo Jehova na n'ulo-ya, o mere ka ha ga nke-ọma.

12 Jehova we me ka Solomon hu Ya anya n'abali, Ọ si ya, Anuwom ekpere-gi, rọputa-kwa-ra Onwem ebe a ibu ulo ichu àjà.

13 Asi na eb͕ochim elu-igwe, miri-ozuzo we ghara idi, ma-ọbu asi na enyem igurube iwu iripia ala, ma-ọbu asi na ezitem ajọ ọria nēfe efe n'etiti ndim;

14 ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.

15 Ub͕u a anyam abua ganāsaghe, ntim abua ganāṅa kwa nti, n'ekpere nke ebe a.

16 Ma ub͕u a arọputawom ulo a, do kwa ya nsọ, ka aham we di n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi: anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.

17 Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, ọbuná ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;

18 M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi guzosie ike, dika Mu na Devid, bú nna-gi, b͕ara ndu, M'we si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'ichi Israel.

19 Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:

20 M'gēropu kwa ha n'elu alam nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham, M'gēme kwa ya ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile.

21 Ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?

22 Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Onye mere ka ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka O meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36