Abù Nke Abù 1 IGBOB

1 Abù nke abù, nke diri Solomon.

2 Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum:N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine.

3 Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma;Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu;N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya.

4 Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso:Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya:Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi,Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine:N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.

5 Onye oji ka m'bu, ma amaram nma,Unu umu-ndinyom Jerusalem,Dika ulo-ikwū nile nke Kida,Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.

6 Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji,N'ihi na anyanwu achawom.Umu nke nnem wesaram iwe di ọku,Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile;Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.

7 Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya,Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie:N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi,N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?

8 Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom,Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu,Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.

9 Inyinyam nke di n'ub͕ọ-ala FeroKa m'wereworo gi tuara, gi eyìm.

10 Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa,Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.

11 Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi,Ya na nkpọchi ọla-ọcha.

12 Mb͕e eze nọ n'oche-ya di buruburu,Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya.

13 Ùkwù myrrh ka onye ihe-ya nātọm utọ burum,N'etiti aram abua ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

14 Uyọkọ nke okoko henna ka onye ihe-ya nātọm utọ burumN'ubi-vine nke En-gedi.

15 Le, i mara nma, eyìm; le, i mara nma;Anya-gi abua di ka nduru.

16 Le, i mara nma, gi onye ihe-gi nātọm utọ, e, i di utọ:Ọzọ, ebe ayi nēdina nācha akwukwọ ndu.

17 Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar,Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8