Eklisiastis 9 IGBOB

1 N'ihi na ihe nile a ka m'tiyere n'obim, ọbuná iledo ihe nile a; na ndi ezi omume, na ndi mara ihe, na òfùfè-ha nile, di n'aka Chineke: ma ọ bu ihu-n'anya ma-ọbu ikpọ-asì, madu adighi-ama ya; ihe nile di n'iru ha.

2 Ihe nile nādakwasi madu nile n'otù uzọ ahu: otù ndabà nādabàra onye ezi omume, dabà-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādighi ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādighi-achu àjà: dika ezi madu si di, otú a ka onye-nmehie di kwa; onye nāṅu iyi di ka onye nātu egwu ọṅuṅu-iyi.

3 Nka bu ihe ọjọ n'ihe nile anēme n'okpuru elu-igwe, na otù ndabà nādabàra madu nile: ọzọ kwa, obi umu madu juputara n'ihe ọjọ, iwi-ara di kwa n'obi-ha mb͕e ha nọ na ndu, ma emesia ha nālakuru ndi nwuru anwu.

4 N'ihi na onye ọ bula nke ejikọtaworo ya na ndi nile di ndu, o nwere ntukwasi-obi: n'ihi na ọ diri nkita di ndu nma kari ọdum nwuru anwu.

5 N'ihi na ndi di ndu mara na ha gānwu: ma ndi nwuru anwu adighi-ama ihe ọ bula, ọ dighi kwa ugwọ-ọlu ha nwere ọzọ; n'ihi na echezọwo ncheta-ha.

6 Ma ihu-n'anya-ha, ma ikpọ-asì-ha, ma ekworo-ha, na mb͕e di anya gara aga ka ọ laworo n'iyì; ọ dighi kwa òkè ha nwere ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi n'ihe ọ bula nke emeworo n'okpuru anyanwu.

7 Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.

8 Ka uwe-gi nile di ọcha mb͕e nile; ka manu-otite nke nēsi ísì utọ ghara kwa ikọnari isi-gi.

9 Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n'anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n'okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n'ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n'ọlu n'okpuru anyanwu.

10 Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.

11 M'laghachiri, hu n'okpuru anyanwu, na ọ bughi ndi nwere ukwu ọsọ ka iwu-ọsọ diri, ọ bughi kwa ndi di ike ka agha diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi mara ihe ka nri diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-nghọta ka àkù diri, ọzọ kwa, ọ bughi ndi-ǹkà ka amara diri; kama mb͕e na ihe-ndaputa nādabàra ha nile.

12 N'ihi na ọbuná madu adighi-ama mb͕e-ya: dika azù nke anānwude n'ub͕u ọjọ, na dika umu nnunu nke nāma n'ọnyà, dika ndia ka umu madu nāma n'ọnyà na mb͕e ọjọ, mb͕e ọ nādakwasi ha na mberede.

13 Otú a kwa ka m'huworo amam-ihe n'okpuru anyanwu, ihe uku ka ọ burum:

14 otù obodo ntà di, ndikom di nime ya di kwa ole-na-ole; ma otù eze uku biara imegide ya, we b͕a ya buruburu, wu kwa ebe ewusiri ike imegide ya:

15 ma achọputara nime ya otù nwoke bu ob͕eye nke mara ihe, onye ahu we me ka obodo ahu wepuga onwe-ya site n'amam-ihe-ya; ma madu echetaghi nwoke ahu bu ob͕eye.

16 Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile.

17 Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n'etiti ndi-nzuzu.

18 Amam-ihe di nma kari ihe-agha nile: ma otù onye-nmehie nāla ọtutu ezi ihe n'iyì.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12