Ezikiel 9 IGBOB

1 O we kpọ òkù na ntim abua n'oké olu, si, Bianu nso, unu ndi-nlekọta nke obodo, onye ọ bula ya jide kwa ihe o ji bibi madu n'aka-ya.

2 Ma, le, ndikom isi nēsi n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama di n'elu, nke nēche iru n'Ugwu, bia, onye ọ bula nējide kwa anyu-ike-agha-ya n'aka-ya; otù nwoke ọzọ di kwa n'etiti ha nke yiri uwe ọcha, mpi ink nke ode-akwukwọ di kwa n'úkwù-ya. Ha we ba, guzo n'akuku ebe-ichu-àjà nke ọla.

3 Ma ebube nke Chineke nke Israel siri n'elu cherub ahu nke ọ di n'elu ya rigorue nbata-uzọ nke ulo ahu: O we kpọ nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink nke ode-akwukwọ n'úkwù-ya, òkù.

4 Jehova we si ya, Gabiga n'etiti obodo a, n'etiti Jerusalem, ka akàrà n'egedege-iru nke ndi ahu ndi nēze ume ndi nāsu kwa ude n'ihi ihe-árú nile nke anēme n'etiti ya.

5 Ma ndikom isi ahu ka Ọ siri na ntim abua, Sonu ya gabiga n'obodo a, tib͕u kwa: anya-unu emela ebere, unu enwe-kwa-la ọmiko:

6 b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.

7 O we si ha, Meruanu ulo a, me ka ndi eb͕uru eb͕u ju ogige-ya nile: puanu. Ha we pua, tib͕ue n'obodo.

8 O rue, mb͕e ha nētib͕u, ma nání mu onwem fọduru, na adaram kpue irum n'ala, tie nkpu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! Ọ̀ bu onye-nbibi nke Israel nile ndi fọduru ka I gābu mb͕e I nāwukwasi Jerusalem ọnuma-Gi?

9 O we sim, Ajọ omume nke ulo Israel na Juda di uku ri nne, ala-ha juputa-kwa-ra n'ọbara, obodo a juputa-kwa-ra na nwezuga ikpé: n'ihi na ha siri, Jehova arapuwo ala nka, ọ dighi kwa Jehova nāhu ihe.

10 Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.

11 Ma, le, nwoke ahu nke yiri uwe ọcha, nke nwere mpi ink n'úkwù-ya, nēweghachi okwu, si, Emewom dika I nyerem iwu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48