Hosea 13 IGBOB

1 Mb͕e Efraim jiri ima-jijiji kwu okwu, ya onwe-ya buliri onwe-ya elu n'Israel: ma ikpe mara ya nime Beal, o we nwua.

2 Ma ub͕u a ha nēmehie kari, we mere onwe-ha arusi apiri api site n'ọla-ọcha-ha, bú arusi di iche iche dika nghọta-ha si di, ọlu nke ndi-ọ̀kà ka ha nile bu: ọ bu bayere ihe ndia ka ha onwe-ha nēkwu okwu, si, Ka ndi nāchu àjà madu sutue umu-ehi ọnu.

3 N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.

4 Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním.

5 Mu onwem mara gi n'ọzara, n'ala kpọrọ oké nku.

6 Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.

7 M'we diri ha ka ọdum: dika agu, ọ bu n'uzọ ka M'gēche anwu:

8 M'gādakwasi ha dika anu-ọhia bear nke b͕ara aka nwa, M'gādọwa anu-aru b͕ochiri obi-ha: M'gēri ha n'ebe ahu dika ọdum; anu ọhia gādọka ha.

9 Ọ bu nbibi-gi, Israel, na i nēmegidem, nēmegide iye-aka-gi.

10 Òle ebe eze-gi nọ ub͕u a, ka o we zọputa gi n'obodo-gi nile? òle ebe ndi-ikpe-gi nọ, ndi i kwuru okwu bayere ha, si, Nyem eze na ndi-isi?

11 Enyem i eze n'iwem, anapukwam ya nime nrubiga-ókè nke iwem.

12 Ihe ekechiri ekechi ka ajọ omume Efraim bu; ihe ezobere ezobe ka nmehie-ya bu.

13 Ihe-nb͕u nile nke nwanyi ime nēme gābiakute ya: ya onwe-ya bu nwa nāmaghi ihe; mb͕e oge eruwo ọ dighi-eguzo n'ebe ib͕ọwaputa umu.

14 N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.

15 Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.

16 Sameria gāhu ahuhu ikpe-ọmuma-ya; n'ihi na ọ nupuwo isi n'okpuru Chineke-ya: site na mma-agha ka ha gāda; agātupia umu-ntakiri-ha, agāb͕awa kwa ndinyom-ha di ime afọ.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14