Ilu 1 IGBOB

1 Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel:

2 Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti;Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;

3 Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;

4 Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:

5 Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya;Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:

6 Ighọta ilu, na okwu miri emi;Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.

7 Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma:Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.

8 Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

9 N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.

10 Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,Ekwela.

11 Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,Ka ayi che anwu ọbara,Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;

12 Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;

13 Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha;

14 Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi;Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:

15 Nwam, esola ha je n'uzọ;B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:

16 N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.

17 N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u,N'anya nnunu ọ bula:

18 Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.

19 Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.

20 Amam-ihe nēti nkpu n'èzí;N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;

21 N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù;N'oghere ọnu-uzọ-ama nile,N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:

22 Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya?Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike?Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?

23 Laghachinu n'iba-nbam:Le, m'gāwupuru unu mọm,M'gēme ka unu mara okwum nile.

24 N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju;Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti;

25 Unu we wezuga ndum-ọdum nile,Unu achọghi kwa iba-nbam:

26 Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì;M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia;

27 Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike,Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe;Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu.

28 Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza;Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam:

29 N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì,Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara:

30 Ha achọghi ndum-ọdum;Ha lelìri iba-nbam nile:

31 Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha,Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.

32 N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha,Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31