Ilu 18 IGBOB

1 Ọchichọ nke ya onwe-ya nāchọsi ike ka onye nēkewapu onwe-ya nāchọ,Ọ bu ezi nzube-ihe nile ka ọ nālusosi ọ̀gù ike.

2 Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ,Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya.

3 Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa,Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro.

4 Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu;Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.

5 Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma,Iwezuga onye ezi omume n'ikpé.Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,

6 Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.

7 Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi,Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.

8 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.

9 Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya,Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.

10 Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu:Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.

11 Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike,Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.

12 N'iru ntipia ka obi madu di elu,Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.

13 Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu,Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.

14 Mọ madu gānagide ọria-ya;Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?

15 Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma;Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.

16 Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara,Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.

17 Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya;Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.

18 Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi,Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.

19 Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike:Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.

20 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula;N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.

21 Ọnwu na ndu di ire n'aka;Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.

22 Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe,Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.

23 Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu:Ma ọgaranya nāza ike ike.

24 Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya:Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31