Ilu 6 IGBOB

1 Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe,Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe,

2 Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà,Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi.

3 Me nka ub͕u a, nwam, we naputa onwe-gi,N'ihi na i bàwo n'ọbu-aka nke madu-ibe-gi;Je, kwe ka azọtọ gi n'ukwu, riọchie madu-ibe-gi nti.

4 Enyela anya-gi abua ura,Enye-kwa-la mbubere-anya-gi irù-ura.

5 Naputa onwe-gi dika mb͕ada n'aka onye-ntá,Na dika nnunu n'aka osi-ọnyà.

6 Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu;Le uzọ-ya nile, we mara ihe:

7 Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi,

8 Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku,Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.

9 Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu?Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie?

10 Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà,Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala;

11 Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe,Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.

12 Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe;O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari;

13 O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu,O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe.

14 Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:Ọ nēzisa ise-okwu.

15 N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

16 Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:

17 Anya di elu, na ire okwu-ugha,Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;

18 Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;

19 Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.

20 Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

21 Hie ha n'obi-gi mb͕e nile,Ke ha n'olu-gi.

22 Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.

23 N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè;Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:

24 Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ,N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.

25 Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi;Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.

26 N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.

27 Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya,Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?

28 Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku,Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?

29 Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di;Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

30 Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu oriImeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:

31 Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa;Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.

32 Onye nākwa nwayi iko, obi amam-ihe kọrọ ya:Onye nēmebi nkpuru-obi nke aka ya ka onye nēme ya bu.

33 Ọnyá-ntiputa na nlelì ka ọ gāhu;Ita-uta-ya kwa, agaghi-ehichapu ya.

34 N'ihi na ekworo bu ọnuma nke nwoke;Ọ gaghi-enwe ọmiko n'ubọchi ọ́bọ̀.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31