Jenesis 25 IGBOB

1 Abraham we luru nwunye ọzọ, nke aha-ya bu Ketura.

2 Ọ muara ya Zimram, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua.

3 Jọkshan muru Sheba, na Dedan. Umu Dedan we buru Ashurim, na Letushim, na Leumim.

4 Umundikom Midian: Ifa na Ifēa, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura.

5 Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere.

6 Ma umu-ndikom nke iko-ndinyom nke Abraham nwere, Abraham nyere ha onyinye di iche iche; o we si n'ebe Aisak nwa-ya nọ zilaga ha n'Iru-anyanwu, rue ala Iru-anyanwu, mb͕e ọ nọ ndu.

7 Ma ndia bu ubọchi arọ nile nke ndu Abraham nke ọ diri, ọgu arọ asatọ na arọ iri na ise.

8 Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

9 Aisak na Ishmael, bú umu-ya, we lìe ya n'ọb͕à Makpila, n'ọhia Efron nwa Zoha onye Het, nke di n'iru Mamre;

10 bú ọhia nke Abraham zutara n'aka umu Het: n'ebe ahu ka elìri Abraham na Sera, bú nwunye-ya.

11 O rue, mb͕e ọnwu Abraham gasiri, na Chineke gọziri Aisak nwa-ya; Aisak we biri n'akuku Bia-lahai-roi.

12 Ndia bu osuso-ọmumu Ishmael, nwa Abraham, onye Hega, bú nwayi Ijipt, bú nwayi nējere Sera ozi, muru nye Abraham:

13 ndia bu kwa aha umu-ndikom Ishmael, n'aha-ha, dika osuso-ọmumu-ha si di: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,

14 na Mishma, na Duma, na Masa;

15 na Hedad, na Tima, na Jetua, na Nafish, na Kidema:

16 ndia bu umu-ndikom Ishmael, ndia bu kwa aha-ha, n'obodo ntà nile ha, na n'ebe-ulo-ikwū nile ha; ndi-isi iri na abua dika mba nile ha si di.

17 Ma ndia bu arọ nke ndu Ishmael, ọgu arọ isi na iri na asa: ọ we kubie ume, nwua; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

18 Ha we biri site na Havila rue Shua nke di n'iru Ijipt, mb͕e i nēje Asiria: n'iru umu-nne-ya nile ka ọ dara ada.

19 Ndia bu osuso-ọmumu Aisak nwa Abraham: Abraham muru Aisak:

20 Aisak b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ lutara Rebeka na nwunye, bú nwa-nwayi Betuel onye Siria nke Padan-eram, nwa-nne-nwayi Leban onye Siria.

21 Aisak we riọ Jehova aririọ n'ihi nwunye-ya, n'ihi na nwayi-àgà ka ọ bu: Jehova we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, Rebeka, bú nwunye-ya, we turu ime.

22 Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase.

23 Jehova we si ya,Mba abua di n'afọ-gi,Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi;Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya;Nke-okenye gēfè nke-ntà.

24 Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n'afọ-ya.

25 Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ.

26 Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.

27 Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū.

28 Aisak we hu Isọ n'anya, n'ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n'ọnu: ma Rebeka huru Jekob n'anya.

29 Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà:

30 Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m'loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n'ihi na ada-wom #mbà; n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom.

31 Jekob we si, Buru uzọ rebem ọnọdu-ọkpara-gi.

32 Isọ we si, Le, mu onwem gaje inwu anwu: ọ̀ gāba-kwa-ram urù gini, bú ọnọdu-ọkpara?

33 Jekob we si, Buru uzọ ṅuaram iyi; ọ ṅuara ya iyi: ọ we rebe Jekob ọnọdu-ọkpara-ya.

34 Jekob we nye Isọ achicha na ofé lentil; o rie ṅu kwa, o bilie, je nke ya: Isọ we leda ọnọdu-ọkpara-ya anya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50