Jenesis 33 IGBOB

1 Jekob we welie anya-ya abua, hu, ma le, Isọ nābia, ya na nnù ndikom. Ọ we ke umu-ya nye Lia, nye kwa Rechel, nye kwa ndinyom abua ahu nēje ozi.

2 Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n'azu ha, na Rechel na Josef n'azu ha.

3 Ya onwe-ya we gabiga n'iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso.

4 Isọ we b͕a ọsọ izute ya, b͕akua ya, dakwasi ya n'olu, sutu ya ọnu: ha we kwa ákwá.

5 Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara.

6 Ndinyom ahu ndi nēje ozi we biarue nso, ha onwe-ha na umu-ha, ha kpọ isi ala.

7 Lia na umu-ya biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala: emesia Josef na Rechel biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala.

8 Ọ si, Ọmuma-ulo-ikwū nka nile nke m'zutere, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? Ọ si, Ihuta amara n'iru onye-nwem.

9 Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere.

10 Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ.

11 Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.

12 Ọ si, Ka ayi bulie ije, ka ayi la, ka m'je kwa n'iru gi.

13 Ọ si ya, Onye-nwem amawo na umum adighi ike, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nke nēnye umu ara di kwa n'akam: ọ buru na achusie ha ike otù ubọchi, ìgwè ewu na aturu nile gānwu kwa,

14 Biko, ka onye-nwem gabiga n'iru orù-ya: ma mu onwem, ka m'nēdu ha nwayọ nwayọ, dika ije-ukwu anu-ulo nke di n'irum, na dika ije-ukwu nke umum si di, rue mb͕e m'gābiakute onye-nwem rue Sia.

15 Isọ we si, Biko, ka m'chiri madu ufọdu nime ndi mu na ha yikọrọ bia, debe n'ebe i nọ. Ọ si, N'ìhi gini kwa? ka m'huta amara n'iru onye-nwem.

16 Isọ we laghachi ubọchi ahu n'uzọ-ya ije Sia.

17 Jekob we bulie ije rue Sukot, wuere onwe-ya ulo, ma-kwa-ra anu-ulo-ya ulo-ntu: n'ihi nka akpọrọ aha ebe ahu Sukot.

18 Jekob we biarue Shelem, bú obodo Shekem, nke di n'ala Kenean, mb͕e o siri na Padan-eram bia; ọ ma ulo-ikwū-ya n'iru obodo ahu.

19 O we zuta òkè ọhia ahu, ebe ọ b͕asara ulo-ikwū-ya, n'aka umu Hemoa, bú nna Shekem, n'ọgu nkpuru-ego ise.

20 O guzo ebe-ichu-àjà ọtọ n'ebe, ahu, kpọ ya, El-elohe-Israel.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50