Job 1 IGBOB

1 Otù nwoke di n'ala Uz, Job bu aha-ya; nwoke ahu zuru okè, zi kwa ezi, ọ nātu kwa egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

2 Ewe muara ya umu-ndikom asa na umu-ndinyom atọ.

3 Ihe-nnweta-ya di nnù ewu na aturu iri-na-asa na ọgu iri, na nnù camel asa na ọgu iri, na nnù ehi abua na ọgu iri ejikọrọ abua abua, na nnù nne-inyinya-ibu na ọgu ise, na ndi-orù bara uba nke-uku; nwoke ahu we di uku kari umu Iru-anyanwu nile.

4 Ma umu-ya ndikom jere me ọṅuṅu-manya-vine n'ulo nwoke ọ bula nime ha n'ubọchi-ya; ha zì-kwa-ra kpọ umu-nne-ha ndinyom atọ iso ha rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

5 O rue, mb͕e ubọchi nile nke ọṅuṅu-manya-vine-ha gasiri buruburu, na Job zìri do ha nsọ, o we bilie n'isi-ututu, sure àjà-nsure-ọku, dika ọnu-ọgugu ha nile si di: n'ihi na Job siri, Eleghi anya umum ndikom emehiweo, b͕akuta kwa Chineke azu n'obi-ha. Otú a ka Job nēme ubọchi nile.

6 Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha.

7 Jehova we si Setan Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.

8 Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

9 Setan we za Jehova, si, Ọ̀ bu n'efu ka Job nātu egwu Chineke?

10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.

11 Ma otú ọ di, biko setipu aka-Gi, metu ihe nile o nwere, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.

12 Jehova we si Setan Le, ihe nile o nwere di n'aka-gi; nání esetila aka-gi metu aru-ya. Setan we si n'iru Jehova pua.

13 O rue, n'otù ubọchi, mb͕e umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n'ulọ nwa-nne-ha, bú ọkpara,

14 na onye-ozi biakutere Job, si, Ìgwè ehi nādọ ihe eji gwu ala-ubi, ìgwè nne-inyinya-ibu nāta nri n'akuku ha:

15 ndi Sheba we dakwasi ha, chiri ha; ọzọ kwa, ha ewerewo ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

16 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ọku nke Chineke esiwo n'elu-igwe da, rechapu ìgwe ewu na aturu, na ndi nējere gi ozi, ripia ha; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

17 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

18 Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom nēri ihe nāṅu kwa manya-vine n'ulo nwa-nne-ha, bú ọkpara:

19 ma, le, oké ifufe siri n'ofè ọzara bia, tie nkuku anọ nke ulo ahu, o we dakwasi umu-okorọbia ahu, ha we nwua; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.

20 Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala;

21 o si, Ọtọ ka m'b͕ara si n'afọ nnem puta, ọtọ ka m'gāb͕a kwa laghachi n'ebe ahu: Jehova nyere, Jehova anarawo kwa; ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi.

22 N'ihe a nile Job emehieghi, ọ sighi kwa na Chineke mere ihe-nzuzu.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42