Job 13 IGBOB

1 Le, ihe a nile ka anyam huworo,Ntim anuwo, ghọta kwa ya.

2 Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem:Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.

3 Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu,Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.

4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,Ndi-dibia efu ka unu nile bu.

5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!Ọ we ghọro unu amam-ihe.

6 Biko, nurunu iru-ukam,Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.

7 Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?

8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?

9 Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?

10 Ọ ghaghi ibara unu nba,Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.

11 Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku?Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?

12 Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu,Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.

13 B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem,Gini gāgabiga kwa n'arum?

14 N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém,Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?

15 Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere:Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.

16 Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa;N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.

17 Nurunu okwum nile nke-ọma,Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.

18 Biko, le, edowom ikpém n'usoro;Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.

19 Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe?N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.

20 Nání emelam ihe abua,Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:

21 Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya;Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.

22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.

23 Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole?Me ka m'mara njehiem na nmehiem.

24 N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?

25 Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?

26 N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem,I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:

27 I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya;I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:

28 Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká,Dika uwe nke nla riworo.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42