Job 29 IGBOB

1 Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na adim dika m'si di n'ọnwa gara aga,Dika n'ubọchi nile mb͕e Chineke nēdebem;

3 Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya,Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri;

4 Otú m'diri n'ubọchi ihe nāgaram nke-ọma,Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm;

5 Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem,Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu;

6 Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile,Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!

7 Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo,Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,

8 Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha,Ndi kara nká biliri, guzo;

9 Ndi-isi kwubìri okwu nile ha,Tukwasi ọbu-aka-ha n'ọnu-ha;

10 Anubìri olu ndi-ndú,Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;

11 N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma;Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:

12 N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya,Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.

13 Ngọzi nke onye nāla n'iyì nābiakwasim:M'nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù.

14 Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya:Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.

15 Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ,Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra.

16 Nna ka m'buru ndi-ob͕eye:Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.

17 M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume,Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.

18 M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume,Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:

19 Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di,Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam:

20 Nsọpurum di ọhu nimem,Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam.

21 Mu ka madu gere nti, we chere,Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.

22 Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua;Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.

23 Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo;Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.

24 M'chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere;Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42