Job 3 IGBOB

1 Mb͕e ihe a gasiri, Job saghere ọnu-ya, kọcha ubọchi-ya.

2 Job we za, si:

3 Ka ubọchi nke amurum nime ya la n'iyì,Ya na abali ahu nke siri, Aturu ime nwa-nwoke.

4 Ka ubọchi ahu ghọ ọchichiri;Ka Chineke ghara isi n'elu ju ase ya,Ka ìhè ghara kwa imukwasi ya.

5 Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya;Ka igwe-oji biri n'elu ya;Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.

6 Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya:Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ;Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa.

7 Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà;Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.

8 Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu,Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.

9 Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri:Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa;Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya:

10 N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta,O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam.

11 N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua?N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume?

12 Gini mere ikperè abua di n'irum inaram?Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua?

13 N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jūM'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:

14 Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa,Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;

15 Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:

16 Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo;Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?

17 N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu;Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.

18 N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū;Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.

19 Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua;Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.

20 N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè?N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?

21 Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia;Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;

22 Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù,Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.

23 N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè,Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?

24 N'ihi na ọ bu tutu eriem nrim ka ize-umem nābia,Anāwusi kwa ọb͕ub͕ọ-ujam nile dika miri.

25 N'ihi na oké egwu ka m'turu, o we biakwasim,Ihe nke m'turu ujọ biakute-kwa-ram.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42