Job 31 IGBOB

1 Mu na anyam abua b͕ara ndu;M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?

2 N'ihi na gìni bu òkè nke Chineke sitere n'elu?Ma-ọbu ihe-nketa nke Onye puru ime ihe nile sitere n'ebe di elu?

3 Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ,Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?

4 Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile,Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?

5 Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari,Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;

6 (Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume,Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)

7 Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya,Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu,Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:

8 Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.

9 Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi,M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:

10 Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri,Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya.

11 N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:

12 N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia,Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.

13 Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,Mb͕e mu na ha nēse okwu:

14 Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili?Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?

15 Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?

16 Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ,Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;

17 Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním,Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;

18 (Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya,Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)

19 Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe,Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;

20 Ọ buru na úkwù-ya agọzighm,Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;

21 Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei,N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:

22 Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu,Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.

23 N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.

24 Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum,Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;

25 Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne,Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;

26 Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu,Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije;

27 Ewe rafue obim na nzuzo,Akam we sutu ọnum ọnu:

28 Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:N'ihi na n'ime ihe a m'gāgọnari Chineke Nke di n'elu.

29 Ọ buru na aǹuriam n'ọdida nke onye nākpọm asi,Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya;

30 (Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehieN'iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya;)

31 Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi,Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!

32 Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali;Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.

33 Ọ buru na ekpuchiwom njehiem nile dika Adam,N'izobe ajọ omumem n'obim,

34 N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba,Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ,M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-

35 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti!(Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;)Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!

36 N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya;M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze.

37 M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum;Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso.

38 Ọ buru na alam etie nkpu megidem,Ọ buru kwa na ọ̀b͕à-ya nile akwakọ ákwá;

39 Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego,Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha:

40 Ka ọhia-ogwu puta n'ọnọdu ọka wheat,Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n'ọnọdu ọka barley.Okwu Job agwusia.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42