Levitikọs 26 IGBOB

1 Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n'ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

2 Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova.

3 Ọ buru na unu ejeghari n'ukpurum nile, ọ buru kwa na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, we me ha:

4 M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha.

5 Nzọcha-ọka-unu gēru ọghughọ-nkpuru-vine, ọghughọ-nkpuru-vine gēru kwa ọghigha-nkpuru: unu gēriju nri-unu afọ, biri kwa n'ala-unu na ntukwasi-obi.

6 M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.

7 Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.

8 Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.

9 M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ.

10 Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu.

11 M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi.

12 M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.

13 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.

14 Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M'nyere n'iwu;

15 ọ buru kwa na unu aju ukpurum nile, ọ buru kwa na nkpuru-obi-unu asọ ikpém nile oyi, unu ewe ghara ime ihe nile M'nyere n'iwu, ka unu we mebie ọb͕ub͕a-ndum;

16 Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.

17 M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.

18 Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu.

19 M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:

20 ike-unu gāgwu kwa n'efu: ala-unu agaghi-ami kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ala agaghi-ami kwa nkpuru-ha.

21 Ma ọ buru na unu ejeghari n'imegidem, we ghara ikwe igem nti; M'gātukwasi kwa unu ihe-otiti ub͕ò asa ọzọ dika nmehie-unu nile si di.

22 M'gēzite anu-ohia n'etiti unu, ha gēme kwa ka unu b͕a aka umu, ha gēb͕upu kwa anu-ulo-unu, me kwa ka unu di ole-na-ole, uzọ nile unu gātọb͕ọ kwa n'efu.

23 Ma ọ buru na adọghi unu aka na nti n'ebe M'nọ site n'ihe ndia, ma unu nējeghari n'imegidem;

24 Mu onwem gējeghari kwa n'imegide unu; M'gēti kwa unu ihe ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.

25 M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.

26 Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.

27 Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti n'ihe a, ma unu nējeghari n'imegidem;

28 M'gējeghari kwa n'imegide unu n'ọnuma; M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa, ọbuná Mu onwem, n'ihi nmehie nile unu.

29 Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa.

30 M'gēme ka ebe di elu nke unu tọb͕ọrọ n'efu, M'gēb͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, tukwasi kwa ozu-unu n'ozu nile nke arusi-unu; nkpuru-obim gāsọ kwa unu oyi.

31 M'gēme obodo nile unu nkpọnkpọ ebe, me kwa ebe nsọ unu ka ha tọb͕ọrọ n'efu, M'gaghi-anu kwa ísì utọ unu.

32 Mu onwem gēme kwa ala-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu: ibobo ya gānwu kwa ndi-iro-unu n'aru, bú ndi di nime ya.

33 Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.

34 Mb͕e ahu ka ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ ala ahu utọ ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu, mb͕e unu onwe unu nọ kwa n'ala ndi-iro-unu; mb͕e ahu ka ala gākwusi n'ọlu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ.

35 Ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu ka ọ gākwusi n'ọlu: nke ọ nākwusighi n'ubọchi-izu-ike-unu, mb͕e unu biri n'elu ya.

36 Ma ndi nāfọdu n'etiti unu, M'gēme ka ida-mbà ba n'obi-ha n'ala ndi-iro-ha: olu nke akwukwọ-osisi ifufe nēfepu gāchu kwa ha; ha gāb͕alaga nb͕alaga mma-agha; ha gāda kwa mb͕e ọ dighi onye nāchu ha.

37 Ha gāsurita ngọngọ, otù n'aru ibe-ya, dika n'iru mma-agha, mb͕e onye nāchu ha adigh: ma nguzosi-ike n'iru ndi-iro-unu agaghi-adiri unu.

38 Unu gāla kwa n'iyì n'etiti mba nile ọzọ, ala ndi-iro-unu gēri kwa unu.

39 Ndi nāfọdu n'etiti unu gāta aru n'ajọ omume-ha n'ala nile nke ndi-iro-unu; ọzọ kwa, n'ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha, ha gēso kwa ha ta aru.

40 Ha gēkwuputa ajọ omume-ha, na ajọ omume nke ndi bu nna-ha, nime nmekpu-ha nke ha mekpurum, ha gēkwuputa kwa na n'ihi na ha jeghariri n'imegidem,

41 Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;

42 M'gēcheta kwa ọb͕ub͕a-ndu Mu na Jekob b͕ara; ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Aisak b͕ara, ọzọ kwa, ob͕ub͕a-ndu Mu na Abraham b͕ara, ka M'gēcheta; ala ahu ka M'gēcheta kwa.

43 Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.

44 Ma ọbuna n'ihe a kwa, mb͕e ha nọ n'ala ndi-iro-ha, M'gaghi-aju ha, M'gaghi-asọ kwa ha oyi, ime ka ha gwusia, na imebi ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ha b͕ara: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke ha:

45 M'gēcheta kwa n'ihi ha ọb͕ub͕a-ndu nke ndi-mbu-ha, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya mba nile ọzọ, ka M'we buru ha Chineke: Mu onwem bu Jehova.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27