Ọnu-Ọgugu 22 IGBOB

1 Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab n'ofè Jọdan na nso Jeriko.

2 Belak nwa Zipoa we hu ihe nile Israel mereri ndi-Amorait.

3 Moab we tua ujọ ndi Israel nke-uku, n'ihi na ọtutu ka ha di; ike gwusia Moab n'iru umu Israel.

4 Moab we si ndi-okenye Midian, Ub͕u a nkpọkọta nka gārachapu ihe nile nke di ayi buruburu, dika ehi nārachapu akwukwọ ndu nke ọhia. Belak nwa Zipoa bu kwa eze Moab na mb͕e ahu.

5 Ọ we zigara Belam nwa Beoa ndi-ozi, rue Petoa, nke di n'akuku Osimiri, bú ala nke umu ndi-ya, ikpọ ya, si, Le, otù ndi esiwo n'Ijipt puta: le, ha ekpuchiwo iru ala, ndi ahu nānọ kwa na ncherita-irum:

6 ma ub͕u a, biko, bia, buaram ndi nka ọnu; n'ihi na ndi di ike ka ọ bu karim: eleghi anya m'gēnwe ike, ka ayi we tib͕ue ha, m'we chupu ha n'ala: n'ihi na amawom na onye i nāgọzi bu onye agọziri agọzi, ma onye i nābu ọnu bu onye anābu ọnu.

7 Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak.

8 o we si ha, Nọnu ọnọdu-abali n'ebe a n'abali a, m'gēweghachi-kwa-ra unu okwu, dika Jehova si agwam okwu: ndi-isi Moab we nọyere Belam.

9 Chineke we biakute Belam, si, Òle ndi bu ndikom ndia nọyere gi?

10 Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si,

11 Le, ndi ahu nke si n'Ijipt puta, ọ nēkpuchi kwa iru ala: ub͕u a, bia kọcharam ha; eleghi anya m'gēnwe ike ibuso ha agha, m'gāchupu kwa ha.

12 Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n'ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu.

13 Belam we bilie n'ututu, si ndi-isi Belak, Lanu n'ala-unu: n'ihi na Jehova n'aju ikwe ka m'soro unu je.

14 Ndi-isi Moab we bilie, biakute Belak, si, Belam nāju isoro ayi bia.

15 Belak we ziga kwa ndi-isi ọzọ, di ọtutu, di kwa nsọpuru, kari ndi ahu.

16 Ha we biakute Belam, si ya, Otú a ka Belak nwa Zipoa siri, Biko, ekwela ka ihe b͕ochie gi ibiakutem:

17 n'ihi na m'ghaghi isọpuru gi nke-uku, ọ bu kwa ihe ọ bula i gāsim ka m'gēme: ma, biko, bia, kọcharam ndi nka.

18 Belam we za, si ndi-orù Belak, Ọ buru na Belak enyewo m ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu nke Jehova, bú Chinekem, ime ihe ntà ma-ọbu ihe uku.

19 Ma ub͕u a, biko, nọdunu n'ebe a, ọbuná unu onwe-unu, abali a, ka m'we mara uka Jehova gākpayere m ọzọ.

20 Chineke we biakute Belam n'abali, si ya, Ọ buru na ọ bu ikpọ gi ka ndikom ahu biara, gi bilie, soro ha je; ma nání okwu nke M'nāgwa gi, nke ahu ka i gēme.

21 Belam we bilie n'ututu, jikwa nne-inyinya-ibu-ya soro ndi-isi Moab je.

22 Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya.

23 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n'uzọ, je n'ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n'uzọ.

24 Mọ-ozi nke Jehova we guzo n'uzọ di warara n'etiti ubi-vine, ogige di n'otú akuku, ogige di kwa n'akuku nke-ọzọ.

25 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, ọ we nuba onwe-ya na mb͕idi, nuba kwa ukwu Belam na mb͕idi ahu: o we tie ya ihe ọzọ.

26 Mọ-ozi nke Jehova we gabiga ọzọ, guzo n'ebe di nkpa, ebe uzọ nādighi madu gēwezuga onwe-ya ga n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

27 Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, o we makpuru n'okpuru Belam: iwe Belam we di ọku, o were nkpa-n'aka-ya tie nne-inyinya-ibu ahu.

28 Jehova we saghe ọnu nne-inyinya-ibu ahu, ọ we si Belam, Gini ka m'meworo gi, na itiwom ihe ub͕ò atọ ndia?

29 Belam we si nne-inyinya-ibu ahu, N'ihi na i kwaram emò: ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mma-agha di n'akam, n'ihi na ub͕u a m'gēb͕uwori gi.

30 Nne-inyinya-ibu ahu we si Belam, Mù onwem abughi nne-inyinya-ibu-gi, nke i nọkwasiworo nam n'ogologo mb͕e-gi rue ta? ànọm nēme gi otú a ma-ọli? Ọ si, É-è.

31 Jehova we saghe anya Belam abua, o we hu mọ-ozi nke Jehova ka ọ nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: o we rube isi, kpọ isi ala n'iru-ya.

32 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini ka i tiworo nne-inyinya-ibu-gi ihe ub͕ò atọ ndia? le, mu onwem aputawo ibu onye-nmegide, n'ihi na uzọ-gi nārida na nbibi n'irum:

33 nne-inyinya-ibu-gi we hum, wezuga onwe-ya n'irum ub͕ò atọ ndia: ọ buru na o wezugaghi onwe-ya site n'irum, n'ezie ub͕u a ọ bu kwa gi onwe-gi ka m'gēb͕uwori, ma ya onwe-ya ka m'gēmewori ka ọ di ndu.

34 Belam we si mọ-ozi nke Jehova, Emehiewom; n'ihi na amaghm na gi onwe-gi nēguzo onwe-gi izutem n'uzọ: ma ub͕u a, ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-gi, m'gālaghachi n'onwem.

35 Mọ-ozi nke Jehova we si Belam, Soro ndikom ahu je: ma nání okwu ahu nke m'gāgwa gi, nke ahu ka i gēkwu. Belam we soro ndi-isi Belak je.

36 Belak we nu na Belam abiawo, o we pua izute ya rue obodo Moab, nke di n'ókè-ala Anon, nke di na nsọtu ókè-ala ahu.

37 Belak we si Belam, Èziteghm ozi ike ike n'ebe i nọ ikpọ gi? n'ìhi gini ka i nābiakuteghm? ọ̀ bu ezi-okwu na apughm isọpuru gi?

38 Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu.

39 Belam we soro Belak je, ha we biarue Kiriat-huzot.

40 Belak we chua ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu n'àjà, we zigara Belam, ziga-kwa-ra ndi-isi ndi ha na ya nọ.

41 O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36