Ọnu-Ọgugu 9 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'arọ nke-abua nke nputa ha si n'ala Ijipt puta, n'ọnwa mbu, si,

2 Ka umu Israel me kwa ememe ngabiga na mb͕e-ya akara àkà.

3 N'ubọchi nke-iri-na-anọ n'onwa nka, n'etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya.

4 Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu.

5 Ha we me ememe ngabiga ahu n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n'etiti ehihie na anyasi, n'ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka umu Israel mere.

6 Ma ndikom ufọdu di, ndi bu ndi ruru árú site n'ozu madu, ha apughi kwa ime ememe ngabiga ahu n'ubọchi ahu: ha we biaru nso n'iru Moses na n'iru Eron n'ubọchi ahu:

7 ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi bu ndi ruru árú site n'ozu madu: n'ihi gini ka anēb͕ochi ayi ka ayi we ghara iweta nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà n'etiti umu Israel?

8 Moses we si ha, Guzonu; ka m'we nu ihe Jehova gēnye n'iwu bayere unu.

9 Jehova we gwa Moses okwu, si,

10 Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ọ bula n'etiti unu ma-ọbu n'etiti ọb͕ọ-unu nile, mb͕e ọ gāru árú site na madu nwuru anwu, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ije di anya, ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga:

11 n'ọnwa nke-abua n'ubọchi nke-iri-na-anọ n'etiti ehihie na anyasi ka ha gēme ya; tiyere achicha ekoghi-eko na ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya:

12 ha agaghi-eme ka ihe fọdu site na ya rue ututu, ọ dighi kwa ọkpukpu ha gētiji nime ya: dika ukpuru nile nke ngabiga ahu si di ka ha gēme ya.

13 Ma nwoke nke di ọcha, nke nānọghi kwa n'ije, ma ọ rapuwo ime ememe ngabiga, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya: n'ihi a o wetaghi nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà, nwoke ahu gēbu nmehie-ya.

14 Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala.

15 N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu.

16 Otú a ka ọ di mb͕e dum: igwe-oji ahu nēkpuchi ya, ya na ọku n'abali, n'ile ya anya.

17 Ma ọ di ka nrigo nke igwe-oji ahu site n'elu Ulo-ikwū si di, emesia umu Israel we bulie ije: ọ bu kwa n'ebe igwe-oji ahu bi, n'ebe ahu ka umu Israel nāma ulo-ikwū-ha.

18 N'okwu-ọnu Jehova ka umu Israel nēbuli ije, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nāma ulo-ikwū-ha: ubọchi nile igwe-oji ahu nēbi n'elu ebe-obibi ahu ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū.

19 Mb͕e igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu ọtutu ubọchi, umu Israel we debe ihe-ndebe nke Jehova, ha ebulighi kwa ije.

20 Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n'elu ebe-obibi ahu; n'okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije.

21 Mb͕e ufọdu di kwa mb͕e igwe-oji ahu nānọ site n'anyasi rue ututu; ma mb͕e igwe-oji ahu rigoro n'ututu, ha we bulie ije: ma n'ehihie ma n'abali, mb͕e igwe-oji ahu rigoro, ha we bulie ije.

22 Ma asi na ọ bu ubọchi abua, ma-ọbu otù ọnwa, ma-ọbu otù arọ, ka igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu, ibi n'elu ya, umu Israel nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, ha ebulighi kwa ije: ma mb͕e emere ka ọ rigo, ha buliri ije.

23 N'okwu-ọnu Jehova ha nāma ulo-ikwū-ha, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije: ihe-ndebe nke Jehova ka ha debere, n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36