Matiu 16 IGBOB

1 Ndi-Farisi na ndi-Sadusi we biakute Ya, jua Ya ka O gosi ha ihe-iriba-ama site n'elu-igwe, nānwa Ya.

2 Ma Ọ zara, si ha, Mb͕e o ruru anyasi, unu nāsi, Iru elu-igwe gādi nma: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie.

3 N'ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia.

4 Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; ma agaghi-enye ya ihe-iriba-ama, ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. O we rapu ha, pua.

5 Ndi nēso uzọ-Ya we bia n'ofè ọzọ, chezọ kwa iji ob͕e achicha.

6 Jisus we si ha, Nēlenu anya, nēze kwa ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha.

7 Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ayi ejighi ob͕e achicha.

8 Ma ebe Jisus mara ya Ọ si, Ndi okwukwe ntà, gini mere unu nēkwurita n'etiti onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha?

9 Ùnu akātugharighi uche, ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha ise nke nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri ahu, na nkata ole unu nara?

10 Ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha asa nke nnù ndikom iri ahu, na abọ ole unu nara?

11 Ùnu si aṅa ghara itughari uche na agwaghm unu okwu bayere ob͕e achicha? Ma nēzenu ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha.

12 Mb͕e ahu ka ha ghọtara na Ọ sighi ha nēze ihe nēko ob͕e achicha, kama ka ha nēze ozizí ndi-Farisi na ndi-Sadusi.

13 Ma mb͕e Jisus biara n'akuku Sisaria Filipi, Ọ jua ndi nēso uzọ-Ya, si, Ònye ka madu nāsi na Nwa nke madu bu?

14 Ha we si, Ufọdu si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ibe-ha si, Jeremaia, ma-ọbu otù nime ndi-amuma.

15 Ọ si ha, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu?

16 Saimon Pita we za, si, Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu.

17 Jisus we za, si ya, Ngọzi nādiri gi, Saimon Bā-Jona: n'ihi na anu-aru na ọbara ekpugheghi ya nye gi, kama ọ bu Nnam Nke bi n'elu-igwe.

18 Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n'elu oké nkume a ka M'gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n'ike.

19 M'gēnye gi nkpisi-ugodi nke ala-eze elu-igwe: ihe ọ bula i gēke kwa ab͕u n'elu uwa, agēke ya n'elu-igwe: ihe ọ bula i gātọpu kwa ab͕u n'elu uwa, agātọpu ya n'elu-igwe.

20 Mb͕e ahu Ọ dọrọ ndi nēso uzọ-Ya aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula na Ya onwe-ya bu Kraist ahu.

21 Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ.

22 Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba, si, Chineke mere Gi ebere, Onye-nwe-ayi: ihe a agaghi-adiri Gi ma-ọli.

23 Ma O chighariri, si Pita, Ga n'azum, Setan: i bu ihe nēme ka M'ma n'ọnyà: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu.

24 Mb͕e ahu Jisus siri ndi nēso uzọ-Ya, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam.

25 N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, ọ gāhu ya.

26 N'ihi na ùrù gini ka ọ gābara madu, ma ọ buru na o gērita uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? ma-ọbu ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya?

27 N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.

28 N'ezie asim unu, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ha gāhu Nwa nke madu ka Ọ nābia n'ala-eze-Ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28