Matiu 24 IGBOB

1 Jisus we si n'ulo uku Chineke pua, we nāga n'uzọ-Ya; ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya igosi Ya owuwu-ulo nile nke ulo uku Chineke.

2 Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n'ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.

3 Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?

4 Jisus we za, si ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu.

5 N'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu.

6 Unu gāje inu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche: lenu ka unu ghara itu ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi.

7 N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche.

8 Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u.

9 Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham.

10 Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì.

11 Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu.

12 N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi.

13 Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.

14 Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n'elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mb͕e ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.

15 Ya mere, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, nke ekwuru site n'ọnu Daniel onye-amuma, ka ọ nēguzo n'ebe nsọ unu (onye nāgu, ya tugharia uche),

16 mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:

17 onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:

18 onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe uku ya.

19 Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.

20 Ma kpenu ekpere ka nb͕apu-unu ghara idi na mb͕e oyi, ma-ọbu n'ubọchi-izu-ike:

21 n'ihi na mb͕e ahu ka nkpab͕u uku gādi, nke ihe dika ya akādighi site na nmalite uwa rue mb͕e a, é-è, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.

22 Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi.

23 Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a, ma-ọbu, N'ebe a; unu ekwela.

24 N'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.

25 Le, agwawom unu mb͕e akēmeghi ya.

26 Ya mere, ọ buru na ha gāsi unu, Le, Ọ nọ n'ọhia; unu apula: Le, Ọ nọ n'ime-ulo; unu ekwela.

27 N'ihi na dika àmùmà si n'Ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue Ọdida-anyanwu; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

28 Ebe ọ bula ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ.

29 Ma ngwa ngwa, mb͕e nkpab͕u mb͕e ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya, kpakpando nile gāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu:

30 mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n'elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n'obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe n'ike na oké ebube.

31 Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.

32 Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;

33 otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia nile, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzọ.

34 N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.

35 Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

36 Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amataghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.

37 Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

38 N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya,

39 ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

40 Mb͕e ahu madu abua gānọ n'ubì; ewere otù, rapu kwa otù:

41 ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù.

42 Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia.

43 Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.

44 N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.

45 Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n'oge-ya?

46 Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

47 N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

48 Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya;

49 ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa;

50 onye-nwe orù ahu gābia n'ubọchi ọ nēleghi anya ya, na n'oge hour ọ nāmaghi,

51 ọ gēb͕ubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n'etiti ndi-iru-abua: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28