Nkpughe 18 IGBOB

1 Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi nelu-igwe ridata, nēnwe ike uku; ewe site n'ebube-ya nye uwa ìhè.

2 O we were olu ike tie nkpu, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, ọ ghọwo kwa ebe-obibi nke ndi-mọ ọjọ, na ulo-nkpọrọ nke mọ nile ọ bula nādighi ọcha, na ulo-nkpọrọ nke nnunu nile ọ bula nke nādighi ọcha nke akpọwo-kwa-ra asì.

3 N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.

4 M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:

5 n'ihi na nmehie-ya nile rapakọrọ n'otù rue elu-igwe, Chineke cheta-kwa-ra ajọ omume-ya nile.

6 Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.

7 Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli.

8 N'ihi nka ọ bu n'otù ubọchi ka ihe-otiti-ya nile gābia, bú ọnwu, na iru-újú, na unwu; agērechapu kwa ya n'ọku; n'ihi na Ọ di ike, bú Onye-nwe-ayi Chineke, Onye kpere ya ikpé.

9 Ndi-eze uwa, ndi soro ya kwa iko nupu kwa isi, ha gākwa-kwa-ra ya ákwá, ti-kwa-ra ya aka n'obi, mb͕e ha gēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya,

10 ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.

11 Ndi-ahia nke uwa nākwa-kwa-ra ya ákwá, nēru-kwa-ra ya újú, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāzu ihe-ahia-ha ọzọ, bú nke ha nēweta n'ub͕ọ-ha;

12 ihe-ahia ọla-edo, na ọla-ọcha, na nkume di oké ọnu-ahia, na pearl, na ezi ákwà ọcha, na ákwà ododo, na nkisi, na ákwà uhie; na osisi nile ọ bula nēsì ísì utọ, na ihe nile ọ bula eji ọdu me, na ihe nile ọ bula eji osisi dikarisiri oké ọnu-ahia, ma-ọbu ọla, ma-ọbu ígwè, ma-ọbu marble, me;

13 na cinnamon, na amomum, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na manu-otite, na frankincense, na manya-vine, na manu, na utu ọkà, na ọka, na anu-ulo, na aturu; na ihe-ahia nke bu inyinya na ub͕ọ-ala na aru madu; na nkpuru-obi madu.

14 Nkpuru-osisi nile nke nāgu nkpuru-obi-gi apuwo n'ebe i nọ, ihe nile nātọ utọ nke ma-kwa-ra nma apuwo kwa n'aka-gi la n'iyì, madu agaghi-ahu kwa ha ọzọ ma-ọli.

15 Ndi-ahia ndi nāzu ihe ndia, ndi gburugburu ọgaranya site na ya, ha gēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nākwa ákwá, nēru kwa újú;

16 nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke eb͕okwasiworo ya ezi ákwà ọcha na ákwà nācha ọbara-ọbara na ákwà uhie, nke ewerewo-kwa-ra ọla-edo na nkume di oké ọnu-ahia na pearl ke ya!

17 n'ihi na n'otù oge hour emere ka oké àkù di otú a tọb͕ọ n'efu. Ndi-isi-ub͕ọ nile n'otù n'otù, na onye ọ bula nke nēje n'ebe ọ bula n'ub͕ọ, na ndi-ub͕ọ, ka ha ra kwa, bú ndi nālu ọlu nime oké osimiri, ha guzo-kwa-ra n'ebe di anya,

18 ti kwa nkpu mb͕e ha nēle anwuru-ọku nke orire-ọku-ya anya, si Òbodo gini yiri obodo uku a?

19 Ha we kpokwasi ájá n'isi-ha, ti kwa nkpu, nākwa ákwá, nēru kwa újú, si, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, nke ndi nile ndi nwere ub͕ọ-ha n'oké osimiri buru ọgaranya nime ya site n'ibi-obi-ya di oké ọnu-ahia! n'ihi na n'otù oge hour ka emere ka ọ tọb͕ọ n'efu.

20 Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.

21 Otù mọ-ozi nke di ike we būru nkume, dika oké nkume-igwe-nri, we tubà ya nime oké osimiri, si, Otú a ka agātuda Babilon, bú obodo uku ahu, n'oké ọdida, agaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli.

22 Agaghi-anu kwa olu ndi nākpọ ubọ-akwara na ndi nākpọ ubọ ọzọ na ndi nēb͕u ọ̀jà na ndi nāfù opì nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-ahu kwa onye-ọ̀kà ọ bula, nke nēme ǹkà ọ bula, nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke nkume-igwe-nri nime gi ọzọ ma-ọli;

23 ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.

24 Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n'elu uwa.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22