10 O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike.
11 Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya.
12 O rue, mb͕e o kpere ọtutu ekpere n'iru Jehova, na Ilai nāriba ọnu-ya ama.
13 Ma Hana, ya onwe-ya nēkwu okwu n'obi-ya; nání egbugbere-ọnu-ya nēme úkpọ̀rọ́, ma anughi olu-ya: Ilai we chè na ọ ṅubigara manya ókè.
14 Ilai we si ya, Rùe ole mb͕e ka i ganāṅubiga manya ókè? wezuga manya-vine-gi n'aru gi.
15 Hana we za, si, É-è, onye-nwem, nwayi nke mọ-ya di arọ́ ka m'bu: ọ dighi manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya m'ṅuworo, kama awusirim nkpuru-obim n'iru Jehova.
16 Agula orù-gi nwayi na nwayi jọb͕uru onwe-ya: n'ihi na ọ bu n'ọtutu ntughari-uchem na nkpasu-iwem ka m'siteworo kwue okwu rue ub͕u a.