21 Nwoke ahu, bú Elkena, na ulo-ya nile we rigo ichuru Jehova aja arọ, na nkwa-ya.
22 Ma Hana arigoghi; n'ihi na ọ siri di-ya, rue mb͕e agēme ka nwata rapu ara, m'gēme kwa ka ọ bia, ka ewe hu ya anya n'iru Jehova, o we biri n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi.
23 Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.
24 Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n'aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n'ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata.
25 Ha we b͕ue oke-ehi ahu, we me ka nwata ahu biakwute Ilai.
26 Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova.
27 Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya: