12 Otù nwoke nke sitere n'ebe ahu we za, si, Ònye bu kwa nna-ha? N'ihi ya ọ ghọrọ ilu, bú okwu a, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?
13 O we bubìe amuma, bia rue ebe di elu ahu.
14 Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel.
15 Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu.
16 Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.
17 Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;
18 o we si umu Israel, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka Israel si n'Ijipt rigota, M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt na n'aka ala-eze nile nke nēmeb͕u unu: