15 Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu.
16 Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.
17 Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;
18 o we si umu Israel, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka Israel si n'Ijipt rigota, M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt na n'aka ala-eze nile nke nēmeb͕u unu:
19 ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n'aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n'iru Jehova n'ebo nile unu, na n'usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.
20 Samuel we me ka ebo Israel nile biarue nso, nzà we ma ebo Benjamin.
21 O we me ka ebo Benjamin biarue nso n'ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya.