2 Ma Sọl nānọdu na nsọtu Gibea n'okpuru osisi pomegranate nke di na Migron: ndi nọ n'aka-ya ra ka nnù ndikom na ọgu iri;
3 Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo.
4 Ma n'etiti ngabiga abua ahu, nke Jonatan chọrọ isi na ha gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, otú ọnu nkume di elu di n'otù ofè, otù ọnu nkume di elu di kwa n'ofè ọzọ: aha otù bu Bozez, aha nke-ọzọ bu Sene.
5 Otù ọnu bu ogidi n'akuku Ugwu na ncherita-iru Mikmash, nke-ọzọ n'akuku Ndida na ncherita-iru Geba.
6 Jonatan we si nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha nke ndia anēbìghi úgwù: eleghi anya Jehova gāluru ayi ọlu: n'ihi na ihe-nb͕ochi adighi n'ebe Jehova nọ izọputa site n'iwere ọtutu madu ma-ọbu site n'iwere madu ole-na-ole.
7 Onye nēbu ihe-agha-ya we si ya, Me ihe nile nke di n'obi-gi: chigharia onwe-gi, le, mu onwem nēso gi dika obi-gi si chọ.
8 Jonatan we si, Le, ayi onwe-ayi nāgabiga rue ndikom ahu, ayi gēkpughe-kwa-ra ha onwe-ayi.