1 Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova.
2 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Elekọtawom ihe Amalek mere Israel, ihe o doro ya n'uzọ, mb͕e o siri n'Ijipt rigota.
3 Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.
4 Sọl we me ka ndi Israel nuru, o we gukọta ha na Telaim, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise ndi ji ukwu eje, na orú nnù ndikom Juda na nnù ise.
5 Sọl we biarue obodo Amalek, rue nbì nime ndagwurugwu.