10 Okwu Jehova we rue Samuel nti, si,
11 Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.
12 Samuel we bilie n'isi-ututu izute Sọl n'ututu; ewe gosi Samuel, si, Sọl biaruru Kamel, ma, le, ọ nēguzoro onwe-ya ihe-ncheta, o we je buruburu, gabiga, ridarue Gilgal.
13 Samuel we biakute Sọl: Sọl we si ya, Onye agọziri agọzi n'ebe Jehova nọ ka i bu: emewom ka okwu Jehova guzosie ike.
14 Samuel we si, Gini bu kwa olu ìgwè aturu na ewu a na ntim, ya na olu ìgwè ehi nke mu onwem nānu?
15 Sọl we si, Ọ bu n'etiti ndi Amalek ka ha si chita ha: n'ihi na ndi Israel nwere ọmiko n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi, ka ha we chuara Jehova, bú Chineke-gi, àjà; ma ayi ewezugawo nke fọduru ka ebibie ya.
16 Samuel we si Sọl, Ra aka, m'gēgosi kwa gi okwu nke Jehova gwaworom n'abali a. O we si ya, Kwue.