25 Ma ub͕u a, biko, b͕aghara nmehiem, sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova.
26 Samuel we si Sọl, M'gaghi-esoro gi laghachi: n'ihi na i juwo okwu Jehova, Jehova ajuwo kwa gi ka i ghara ibu eze Israel.
27 Samuel we chigharia ila, ma o jidere ọnu-ọnu uwe-nwuda-ya, o we dọwa.
28 Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n'aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi.
29 Ọzọ kwa, Ebube Israel agaghi-ekwu okwu-ugha, Ọ gaghi-echeghari kwa: n'ihi na Ọ bughi madu nke Ọ gēji cheghari.
30 O we si, Emehiewom: biko, sọpurum ub͕u a n'iru ndi-okenye ndim, na n'iru Israel; sorokwam laghachi, ka m'we kpọ isi ala nye Jehova, bú Chineke-gi.
31 Samuel we laghachi soro Sọl n'azu; Sọl we kpọ isi ala nye Jehova.