9 Mọ ọjọ nke Jehova we di n'aru Sọl, ma ya onwe-ya nānọdu n'ulo-ya, ube-ya di kwa n'aka-ya; Devid we were aka-ya nākpọ ubọ.
10 Sọl we chọ iwere ube ahu tugide Devid ọbuná na mb͕idi; ma o repuru n'iru Sọl, ọ we tugide ube ahu na mb͕idi: Devid we b͕alaga, wepuga onwe-ya n'abali ahu.
11 Sọl we ziga ndi-ozi n'ulo Devid, iche ya nche, na ime ka ọ nwua n'ututu: Maikal, bú nwunye-ya, we gosi Devid, si, Ọ buru na i zọputaghi ndu-gi abali a, agēme ka gi onwe-gi nwua echi.
12 Maikal we weda Devid site na window: o we je, b͕alaga, wepuga onwe-ya.
13 Maikal we were terafim-ya, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya, tiye ákwà-ob͕ub͕o eji aji ewu me n'okpuru isi-ya, were ákwà-nb͕okwasi kpuchie ya.
14 Sọl we ziga ndi-ozi iwere Devid, ma Maikal siri, Aru adighi ya ike.
15 Sọl we ziga ndi-ozi ahu ihu Devid, si, Bugotaram ya n'ihe-ndina-ya, ka m'we me ka ọ nwua.