11 Jonatan we si Devid, Bia, ka ayi pua je n'ọhia. Ha abua we pua je n'ọhia.
12 Jonatan we si Devid, Jehova, bú Chineke Israel, Ya buru onye-àmà; mb͕e m'gēnyochata obi nnam dika mb͕e a echi, ma-ọbu nwa-nne-echi, ma, le, ọ di nma n'ebe Devid nọ, #m'gaghi-ezite-kwa-ra gi ozi, we kpughepu nti-gi ka i nu ya?
13 Jehova me Jonatan otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, mb͕e ọ di nnam nma ime gi ihe ọjọ a, ma m'kpughepughi nti-gi ka i nu ya, we zilaga gi, ka i we la n'udo: Jehova nọye-kwa-ra gi, dika Ọ nọyeworo nnam.
14 Ma ọ bughi nání mb͕e m'nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m'we ghara inwu:
15 kama i gaghi-ebipu kwa ebere-gi n'ulom rue mb͕e ebighi-ebi: i gaghi-ebipu kwa ya mb͕e Jehova bipuworo ndi-iro Devid, nwoke ọ bula n'elu uwa.
16 Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid.
17 Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya.