1 Devid we si n'ebe ahu je, wepuga onwe-ya rue ọb͕à Adulam: umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we nu ya, ha we ridakuru ya n'ebe ahu.
2 Ha we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n'ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n'aka-ya.
3 Devid we si n'ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n'etiti unu, rue mb͕e m'mara ihe Chineke gēmerem.
4 O we duru ha bia n'iru eze Moab: ha we biri n'aka-ya ubọchi nile Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike.
5 Gad, bú onye-amuma, we si Devid, Anọdula n'ebe a ewusiri ike; je, bara onwe-gi n'ala Juda. Devid we je, ba n'oké ọhia Heret.
6 Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n'okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n'aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n'akuku ya.
7 Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n'akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?