14 Devid we nọdu n'ọzara n'ebe ewusiri ike, o we nọdu n'ugwu n'ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n'aka-ya.
15 Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n'ọzara Zif n'oké ọhia.
16 Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n'oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke.
17 Ọ si ya, Atula egwu: n'ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka.
18 Ha abua we b͕a ndu n'iru Jehova: Devid we nọdu n'oké ọhia, ma Jonatan lara n'ulo-ya.
19 Ndi Zif we rigokuru Sọl rue Gibea, si, Devid, ò zoghi onwe-ya n'etiti ayi n'ebe ewusiri ike n'oké ọhia, n'ugwu ntà Hakila, nke di na Ndida nke ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu?
20 Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze.