1 O rue, mb͕e Sọl siri n'iso ndi Filistia lata, na egosiri ya, si, Le, Devid nọ n'ọzara En-gedi.
2 Sọl we chiri nnù ndikom asa na ọgu iri arọputara n'Israel nile, ọ je ichọ Devid na ndikom-ya n'elu oké nkume nke ewu-ọhia.
3 Ọ biarue ogige ìgwè ewu na aturu n'uzọ, ọb͕à di kwa n'ebe ahu; Sọl we ba ikpuchi ukwu-ya. Ma Devid na ndikom-ya nānọdu n'akuku ime ọb͕à ahu.
4 Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n'aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n'anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere.
5 O rue, ka emesiri, na obi Devid tara ya uta, n'ihi na o bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda Sọl nwere.
6 Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m'gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.
7 Devid we were okwu ndia b͕ochie ndikom-ya, o kweghi kwa ka ha bilie imegide Sọl. Sọl we si n'ọb͕à ahu bilie, je ije-ya.