6 Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m'gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.
7 Devid we were okwu ndia b͕ochie ndikom-ya, o kweghi kwa ka ha bilie imegide Sọl. Sọl we si n'ọb͕à ahu bilie, je ije-ya.
8 Devid we bilie ka emesiri, si n'ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n'azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n'azu-ya, Devid we rube iru-ya n'ala, kpọ isi ala.
9 Devid we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi?
10 Le, ubọchi ta ka anya-gi abua huworo otú Jehova nyere gi n'akam ta n'ọb͕à: ewe si ka m'b͕ue gi: ma anyam mere gi ebere; m'we si, M'gaghi-eseti akam megide onye-nwem, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.
11 Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n'akam: n'ihi na nime nbipu m'bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n'akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya.
12 Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi.