10 Nebal we za ndi-orù Devid, si, Ònye bu Devid? ònye bu kwa nwa Jesi? ọtutu orù di ta ndi nētiwapu onwe-ha, onye ọ bula n'aka onye-nwe-ya.
11 M'gēwere kwa achicham na mirim na anum eb͕uru eb͕u nke m'b͕uworo bayere ndim nākpacha aji anu, nye ndikom ndi m'nāmaghi ebe ha si bia?
12 Umu-okorọbia Devid we chigharia n'uzọ-ha, lata, bia gosi ya dika okwu ndia nile si di.
13 Devid we si ndikom-ya, Kenu, nwoke ọ bula mma-agha-ya n'úkwù-ya. Ha we ke, nwoke ọ bula mma-agha-ya, n'úkwù; Devid we ke kwa mma-agha-ya n'úkwù: ihe ra ka nnù ndikom we soro Devid n'azu rigo; ọgu ndikom iri we nọdu n'ebe ihe-ha di.
14 Ma otù okorọbia nime umu-okorọbia Nebal gosiri Abigail, bú nwunye Nebal, si, Le, Devid siri n'ọzara zite ndi-ozi igọzi onye-nwe-ayi; o we makwasi ha.
15 Ma ndikom ahu di nma nke-uku ka ha si me ayi, emeghi kwa ka ihere me ayi, ọ dighi kwa ihe ọ bula ayi lere anya ya na o furu efu n'ubọchi nile ayi na ha nējeghari, mb͕e ayi nọ n'ọhia:
16 ha buru ayi mb͕idi ma abali ma ehihie, ubọchi nile ayi na ha nọ mb͕e ayi nāzù ìgwè ewu na aturu.