39 Devid we nu na Nebal anwuruwo, ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye kpere ọnu ihe-ita-utam n'ikpé, me ka m'pua n'aka Nebal, O we b͕ochie orù-Ya ka ọ ghara ime ihe ọjọ: ma ihe ọjọ Nebal ka Jehova meworo ka ọ lata n'isi-ya. Devid we ziga kwue okwu bayere Abigail, iluta ya n'onwe-ya na nwunye.
40 Ndi-orù Devid we biakute Abigail rue Kamel, gwa ya okwu, si, Devid ezitewo ayi biakute gi ilutara ya gi onwe-gi na nwunye.
41 O we bilie, kpọ isi ala, kpue iru-ya n'ala, si, Le, orù-gi nwayi bu nwayi nēje ozi isa ukwu ndi-orù onye-nwem.
42 Abigail we me ngwa, bilie, nọkwasi n'inyinya-ibu, ya na umu-ab͕ọghọ-ya ise ndi nējeso ya n'ukwu n'ukwu; o we nējeso ndi-ozi Devid n'azu, ghọrọ ya nwunye.
43 Devid kuru-kwa-ra Ahinoam nke Jezreel; ha we ghọrọ ya nwunye, ọbuná ha abua.
44 Ma Sọl were Maikal nwa-ya, bú nwunye Devid, nye Palti nwa-nwoke Laish, onye sitere na Galim.