6 si kwa ya otú a, Ndu-gi! gi onwe-gi, udo; ulo-gi, udo kwa; ihe nile i nwere, udo kwa.
7 Ma ub͕u a anuwom na i nwere ndi nākpacha aji anu: ub͕u a ayi na ndi-ọzùzù-aturu i nwere anọwo, ayi emeghi ka ihere me ha, ọ dighi kwa ihe ọ bula ha lere anya ya na o furu efu, ubọchi nile ha nọ na Kamel.
8 Jua umu-okorọbia-gi, ha gēgosi kwa gi: ka umu-okorọbia huta kwa amara n'iru gi; n'ihi na ọ bu n'ezi ubọchi ka ayi biaworo: biko, nye ndi-orù-gi, nye kwa nwa-gi Devid, ihe aka-gi gāchọta.
9 Umu-okorọbia Devid we bata, gwa Nebal okwu n'aha Devid dika okwu ndia nile si di, we nọdu du.
10 Nebal we za ndi-orù Devid, si, Ònye bu Devid? ònye bu kwa nwa Jesi? ọtutu orù di ta ndi nētiwapu onwe-ha, onye ọ bula n'aka onye-nwe-ya.
11 M'gēwere kwa achicham na mirim na anum eb͕uru eb͕u nke m'b͕uworo bayere ndim nākpacha aji anu, nye ndikom ndi m'nāmaghi ebe ha si bia?
12 Umu-okorọbia Devid we chigharia n'uzọ-ha, lata, bia gosi ya dika okwu ndia nile si di.