7 Sọl we si ndi-orù-ya, Chọrọnum nwayi nwere mọ ọ nāju ihe, ka m'we jekuru ya, jua ya ase. Ndi-orù-ya we si ya, Le, otù nwayi di n'En-doa nke nwere mọ ọ nāju ihe.
8 Sọl we nwogharia onwe-ya, yiri uwe ọzọ, je, ya onwe-ya na ndikom abua tiyere ya, ha we biakute nwayi ahu n'abali: ọ si, Biko, were mọ i nāju ihe juaram ase, me ka ọ rigokutem, bú onye ọ bula m'gāsi gi.
9 Nwayi ahu we si ya, Le, gi onwe-gi amawo ihe Sọl mere, na o bipuwo n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāb͕ara ndum ọnyà ime ka m'nwua?
10 Sọl we were Jehova ṅuara ya iyi, si, Jehova nādi ndu, Ahuhu ajọ omume agaghi-ezute gi ma-ọli n'ihe a.
11 Nwayi ahu we si, Ònye ka m'gēme ka ọ rigokute gi? Ọ si, Me ka Samuel rigokutem.
12 Nwayi ahu we hu Samuel, tie nkpu n'oké olu: nwayi ahu we gwa Sọl okwu, si, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom? n'ihi na gi onwe-gi bu Sọl.
13 Eze we si ya, Atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu gini ka i huworo? Nwayi ahu we si Sọl, Ahuwom chi ka ha nēsi n'ala rigota.