6 Jehova we kpọ kwa òkù ọzọ, si, Samuel. Samuel we bilie jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù, nwam; jeghachi dina ala.
7 Ma Samuel akāmaghi Jehova, akēkpugheghi kwa okwu Jehova nye ya.
8 Jehova we kpọ Samuel òkù ọzọ nke ub͕ò atọ. O we bilie, jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ilai we ghọta na Jehova nākpọ nwa-okoro ahu òkù.
9 Ilai we si Samuel, Je, dina ala: ọ gēru kwa, ọ buru na Ọ kpọ gi òkù, na i gāsi, Kwue, Jehova; n'ihi na orù-Gi nānu. Samuel we je, dina ala n'ebe-ya.
10 Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n'ihi na orù-Gi nānu.
11 Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n'Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.
12 N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.