9 Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n'azu guzoro n'ebe ahu.
10 Ma Devid nāchu, ya onwe-ya na nnù ndikom: ma ọgu ndikom iri guzoro n'azu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi igabiga miri-iyi Besoa:
11 ha we huta onye Ijipt n'ọhia, kuru ya jekuru Devid, nye ya achicha, o rie; ha we me ka ọ ṅua miri:
12 ha we nye ya iberibe mbadamba fig, na uyọkọ abua nke nkpuru-vine amiri ami; o we rie, mọ-ya we laghachikute ya: n'ihi na o righi nri, ọ ṅughi kwa miri, ubọchi atọ ehihie na abali.
13 Devid we si ya, Ònye nwe gi? òle ebe i si bia kwa? Ọ si, Nwa-okorọbia Ijipt ka m'bu, m'buru kwa otù nwoke, bú onye Amalek, orù; onye-nwem we rapum, n'ihi na aru adighm ike ubọchi atọ gara aga.
14 Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.
15 Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.