12 Otù nwoke onye Benjamin we si n'usoro agha ahu b͕a ọsọ, biarue Shailo n'ubọchi ahu, uwe nwuda ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi ya n'isi.
13 Ọ we bia, ma, le, Ilai nānọkwasi n'oche-ya n'akuku uzọ, nēche nche: n'ihi na obi-ya nāma jijiji n'ihi ib͕e Chineke. Nwoke ahu we ba igosi ya n'obodo, obodo ahu nile we tie nkpu.
14 Ilai we nu olu iti-nkpu ahu, si, Gini bu olu ùzù a? Nwoke ahu we me ngwa bata, gosi Ilai.
15 Ma Ilai b͕ara ọgu arọ anọ na iri na asatọ; anya-ya abua guzoro eguzo, ọ pughi kwa ihu uzọ.
16 Nwoke ahu we si Ilai, Mu onwem bu onye si n'usoro agha bia, mu onwem si kwa n'usoro agha b͕alaga ta. O we si, Gini bu ihe emere, nwam?
17 Onye ahu nke nēzì ozi ahu we za, si, Israel ab͕alagawo n'iru ndi Filistia, ọzọ kwa, oké ntib͕u adiwo n'etiti ndi Israel, ọzọ kwa, umu-gi ndikom abua, bú Họfnai na Finehas, anwuwo, ewerewo kwa ib͕e Chineke.
18 O rue, mb͕e o hotara ib͕e Chineke, na o si n'oche-ya dala azu n'akuku ọnu-uzọ-ama, olu-ya we b͕ajie, o we nwua: n'ihi na nwoke ahu bu agadi, di kwa arọ́. Ya onwe-ya kpe-kwa-ra Israel ikpe ọgu arọ abua.