15 Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,
16 Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.
17 Mb͕e Samuel huru Sọl, Jehova we za ya, si, Le nwoke ahu onye M'siri gi te manu! onye a gēb͕ochi ndim n'ime ihe ọjọ.
18 Sọl we biarue Samuel nso n'etiti ọnu-uzọ-ama, si, Biko, gosim ebe ọ di, bú ulo onye-ọhu-uzọ.
19 Samuel we za Sọl, si, Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu; rigorue ebe di elu n'irum, unu gēsokwam ri ihe ta: m'gēzilaga kwa gi n'ututu, ihe nile nke di n'obi-gi ka m'gēgosi kwa gi.
20 Ma nne-inyinya-ibu-gi nke funariri gi, ta bu ubọchi atọ, atukwasila obi-gi na ha; n'ihi na achọtawo ha. Ma ònye nwere ihe nile anāchọsi ike nke Israel? ọ bughi gi na ulo nile nke nna-gi?
21 Sọl we za, si, Ọ̀ bughi onye Benjamin ka m'bu, sitere n'ebo Israel nke dikarisiri ntà? ab͕urum, ọ̀ pekarisighi npe n'etiti ab͕uru nile nke ebo Benjamin? n'ìhi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di?