25 O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal.
26 Ha we buputa ogidi nke ulo Beal, sure ha ọku.
27 Ha kwatu-kwa-ra ogidi Beal, kwatu kwa Beal, me ka ọ buru olùlù-ọkwu, rue ta.
28 Jihu we kpochapu Beal n'Israel.
29 Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n'iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan.
30 Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel.
31 Ma Jihu elezighi anya ijeghari n'iwu Jehova, bú Chineke Israel, n'obi-ya nile: o wezugaghi onwe-ya pua na nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie.