6 O we degara ha akwukwọ nke ub͕ò abua, si, Ọ buru na mu ka unu diri, ọ buru kwa na olum ka unu onwe-unu nēge nti, chirinu isi ndikom ahu, bú umu onye-nwe-unu, biakutem dika mb͕e a echi rue Jezreel. Ma umu eze, bú ọgu ndikom atọ na iri, nọ n'aka ndi uku obodo ahu, ndi nāzùlite ha.
7 O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n'aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel.
8 Onye-ozi we bia, gosi ya, si, Ha ebubatawo isi umu eze. Ọ si, Tukọbanu ha n'obo abua n'oghere ọnu-uzọ-ama rue ututu.
9 O rue, n'ututu, na ọ puru, guzo, si ndi Israel nile, Ndi ezi omume ka unu bu: le, mu onwem kekọtara madu imegide onye-nwem, b͕ue ya: ma ònye tib͕uru ndia nile?
10 Maranu ub͕u a na ọ dighi okwu ọ bula gāda n'ala nime okwu Jehova, nke Jehova kwuru bayere ulo Ehab: n'ihi na Jehova emewo ihe O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija.
11 Jihu we tib͕ue ndi nile fọduru ulo Ehab nime Jezreel, na ndi uku ya nile, na ndi ọ mara nke-ọma, na ndi-nchu-àjà-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.
12 O bilie, bia, jerue Sameria. Mb͕e ya onwe-ya ruru ulo-nlibe-anu nke ndi-ọzùzù-aturu n'uzọ,