2 Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.
3 O we nọ n'aka-ya n'ulo Jehova nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.
4 Ma n'arọ nke-asa Jehoiada zigara chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi diri ndi-Karait, na ndi diri ndi-ọb͕a-ọsọ, o me ka ha bakute ya n'ulo Jehova; ya na ha we b͕a ndu, o me ka ha ṅua iyi n'ulo Jehova, o me kwa ka ha hu nwa eze.
5 O we nye ha iwu, si, Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, ganēdebe kwa ihe-ndebe ulo eze;
6 otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama Sua; otù uzọ n'uzọ atọ gādi kwa n'ọnu-uzọ-ama n'azu ndi-ọb͕a-ọsọ: unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ulo a, buru ihe-nb͕ochi.
7 Ma usu abua ahu nime unu, bú ndi nile nāpu apu n'ubọchi-izu-ike, ha gēdebe kwa ihe-ndebe ulo Jehova buruburu eze.
8 Unu gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata nime akuku-unu, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nāpu n'èzí, na mb͕e ọ nābà nime.