4 Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n'ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n'obi nwoke ọ bula iwebata n'ulo Jehova,
5 ka ndi-nchu-àjà were ya n'onwe-ha, nwoke ọ bula site n'aka onye ọ mara: ha onwe-ha gēme ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike, ebe ọ bula agāchọta ebe etipúru etipú.
6 O rue, n'arọ nke-orú-na-atọ nke eze, bú Jehoash, na ndi-nchu-àjà emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.
7 Eze, bú Jehoash, we kpọ Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa ndi-nchu-àjà ọzọ, si ha, Gini mere unu emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike? ma ub͕u a unu anarala ego n'aka ndi unu mara, kama nyenu ya ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.
8 Ndi-nchu-àjà we kwere ka ha ghara inara ego n'aka ndi Juda, ka ha ghara kwa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.
9 Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we were otù ib͕e, rapúe oghere n'okwu-ya, dọba ya n'akuku ebe-ichu-àjà, n'aka-nri nke ebe madu nābà n'ulo Jehova: ndi-nchu-àjà ndi nēche nbata-uzọ we tiye n'ebe ahu ego nile anēwebata n'ulo Jehova.
10 O rue, mb͕e ha huru na ego ahu riri nne n'ib͕e ahu, na ode-akwukwọ eze na onye-isi-nchu-àjà rigoro, ke ego ahu n'ihe, gu kwa ya, bú nke achọtara n'ulo Jehova.