15 Elaisha we si ya, Chiri uta na àkú: o we chiri uta na àkú n'aka-ya.
16 Ọ si eze Israel, Tukwasi aka-gi n'uta: o we tukwasi aka-ya. Elaisha we tukwasi aka-ya abua n'aka abua nke eze.
17 Ọ si, Meghe window n'akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n'Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia.
18 Ọ si, Chiri àkú: o we chiri ha. Ọ si eze Israel, Tida n'ala: o we tie ub͕ò atọ, guzo.
19 Onye nke Chineke ahu we wesa ya iwe, si, Asi na i tiri ub͕ò ise ma-ọbu ub͕ò isi; mb͕e ahu i gēti Siria rue mb͕e i gēme ka ọ gwusia: ma ub͕u a i gēti Siria nání ub͕ò atọ.
20 Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n'ala mb͕e arọ ọhu biara.
21 O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n'ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n'ukwu-ya abua.