14 Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.
15 Ma ihe Jehoash nile nke fọduru, nke o mere, na idi-ike-ya, na otú o busoro Amazaia, bú eze Juda, agha èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
16 Jehoash we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya nime Sameria n'ebe elìri ndi-eze Israel; Jeroboam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
17 Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Jehoash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.
18 Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?
19 Ha we kekọta nkekọta-madu megide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.
20 Ha we bute ya n'elu inyinya: ewe lìe ya nime Jerusalem n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid.